"Oke ọnụahịa ọgwụ Bekee na-ada na Naịjịrịa na-egbochi anyị ibi ogologo ndụ" - BBC News Ìgbò (2024)

"Oke ọnụahịa ọgwụ Bekee na-ada na Naịjịrịa na-egbochi anyị ibi ogologo ndụ" - BBC News Ìgbò (1)

Ebe foto si, Getty Images

Ebe akụkọ a si
  • Onye dere ya, Makuochi Okafor & Chigozie Ohaka
  • Ndị mere akụkọ a, BBC News
  • Ebeg o si Lagos, Nigeria

Ọrịrị ọnụahịa ihe ndị e ji ebi ndụ nke ọgwụ Bekee so na ya emeela ka ụfọdụ mmadu ghara nweta ezi nlekọta n'ụlọọgwụ

Ọnụego ọgwụ abawanyela n'ihe dịka ọnwa ole ma ole gara aga, nke a kpatara na ụfọdụ mmadụ enweghịzi ike ịzụta ya na mba ihe ruru pasentị 60 bụ ndị ogbenye .

Mgbanwe n'ego 'Inflation' nke ruru pasentị 33.2% mere n'Naịjirịa n'ọnwa maachị afọ 2023, nke a bụ nke kacha n'obodo Naịjirịa n'ime onwa iri atọ. Nke a mere ka ọnụ ego ihe niile gbawee tinyere ịwepụ ọnụ ego mmanụ ụgbọala gọọmentị etiti wepụrụ.

Mịnista na-ahụ maka ahuike bụ Muhammed Ali Pate gwara BBC na ọ bụ mgbago na-mgbatu ego ofesi mere ka ọgwụ ndị ahụ a na-ebuta n'Naịjirịa kpatara ya.

Mịnịsta ahụ kwuru anaghị edebanye aha n'akwụkwọ atụmatụ mkpuchi ahụike mere ka ụfọdụ jiri ego ha na-azute ọgwụ.

Gọọmenti etiti kwuru na ya na-agba mbọ ịbutu ọnụ ego ọgwụ. Mịnistri na-ahụ maka ahụ ike na nsonso a kwere nkwa ịme ka ụlo ọgwụ dị n'ime obodo nwe ike ịbubeta ihe ndị e ji emepụta ọgwụ.

Odoghị anya mgbe nke a ga-amalite.

Dịka Ulọọrụ ahuike mba uwa bụ World Health Organization (WHO) siri kwu, ọgwụ dị pasentị 95 e ji agwọ ọria n'Afrịka bụ nke si mba ofesi. N'ọnụ ọgụ ọgwụ niilw dị n'ụwa, naanị pasentị atọ ka mba Afrịka na-emepụta. Ọ bụ naanị Kenya, Naịjirịa na Saut Afrịka nwere ụlọọrụ na-emeputa ọgwụ.

Ọrịa Covid-19 gosipụtara mkpa ọ dị ịmepụta ọgwụ na mpaghara a. N'ọnwa Febụwarị, ndị isi Afrịka, nke ndị Africa Centre for Disease Control and Prevention (Africa CDC) na-edu, kwetara n'atụmatụ ka mba Afrịka jikọ aka ọnụ zụta nnukwu ọgwụ mgbochi, nke ga-enya ha ohere ịmekọrịta ọnụ ahịa ka mma.

Atumatu a bukwa n'obi ịkwalite nrụpụta ọgwụ na mpaghara a ọkachasị ebe a na-eme ihe na-erughị otu pasent nke ọgwụ mgbochi na kọntinent Afrịka. Atụmatụ ka a na-atụ anya ịkwalite mmepụta ọgwụ ruru pasenti 60 tupu afọ 2040.

"Oke ọnụahịa ọgwụ Bekee na-ada na Naịjịrịa na-egbochi anyị ibi ogologo ndụ" - BBC News Ìgbò (2)

'Ana m eji mgbọrọgwụ na mkpọakwụkwọ eme ọgwụ'

Ka ọ dị ugbu a, ndị Naịjirịa dịka Jane Aibangbe gbara afọ 29 bị na Legọs bụ onye chọrọ ọgwụ kwa mgbe kwa mgbe, bụ onye ịrịgo ọnụ ego ọgwụ na-emetụta.

Jane na-arịa ọrịa 'lupus erythematosus', ọrịa na-emetụta ngwa nchekwa ahụ mmadụ (immune system).

Ọnụ ego ọgwụ ya eruola 35,000 naịra n'ọnwa Febuwarị 2024 site na 21,000 ọ nọ na ya na mbido afọ 2023.

Jane onye na-enweghị ike ịzute ọgwụ ya jụrụ "Obi adighị ụtọ, mana kedụ ihe m ga-eme?

Di ka Jane, Sarah Erekosima gbara afọ28 na-arịa ọrịa ụkwara umeọkụ (asthma) ihe dị ọtụtụ afọ. Mgbe ọnụ ego ọgwụ gbagoro, onwela ihe mgbanwe na etu o si ebi ndụ ya.

"A na m aṅụ mmiri okụ tinyere n'okpomoọkụ dị na Legọs ị ji belata ọrịa ụkwara umeọkụ ya" Sarah kwuru....

Ego ọgwụ ya bụbu 9,000 naịra n'ọnwa Mee 2023, mana ugbu a, ọ bụzi 67,000 naịra n'ọnwa Maachị 2024.

O kwuru "Ọ bụ maka ahuike m, a chọrọ m ịbị ogologo ndụ mana ọ garara ọnụ"

Dị ka Sarah, Rhoda Husseini, onye ọzọ na-arịa ụkwara umeọkụ si n'obodo Wamba, kwuru na ya enweghịzi ike ị nweta ihe ikuku 'Ventolin' nke na-enyere aka.

"Enweghị m ike ị nweta ihe ikuku 'Inhaler' na mkpụrụ ogwụ mgbe ụfọdụ adịghịkwa adị. Ana m eji ahịhịa ọdịnala eme ihe ọgwụ, n'agbanyeghị na ọ nweghị ihe gosiri na ọgwụgwọ ọdịnala ahụ dị irè.

Uche Tralagba, bụ dọkịta na Legọs kwuru na ọ na-echegbu onwe ya maka etu oke ọnụ ahịa ọgwụ si emetụta ndị ọrịa ya.

Ọ na-ekwu, "Ụfọdụ ndị ọrịa na-ama ụma na-aṅụ ọgwụ ka ọgwụ ahụ wee dịruo ogologo oge."

"Enwekwala m ụfọdụ ndị a kwụsịrị ọgwụ ahụ kpamkpam n'ihi na ha enweghị ike ị nweta ha, nke kpatara ọnọdụ ha na-akawanye njọ ebe ụfọdụ anwụọla."

N'okwu Dokịta Tralagba, ọnọdụ akụnaụba siri ike dị ka ọ na-amanye ọtụtụ ndị ọrịa ịchefu ọdịmma ha.

“Ụfọdụ ajụla iwepụta oge ezumike n'ọrụ n'agbanyeghị na ha ejighị ahụike. Ha na-aga n'ihu na-arụ ọrụ naanị ka ha nwee ike ị nweta ọgwụgwọ, wee na-egbochi ahụ ha ezumike ha chọrọ iji gbakee"

Cyril Usifoh, onyeisi otu Pharmaceutical Society of Nigeria, na-ekwu na gọọmentị nwere ike imeziwanye ọnọdụ ahụ site n'inyekwu ụtụ isi nye ndị na-ebubata ngwaahịa na ibelata nnukwu ụtụ isi n'ọgwụ.

Ọ na-ekwu na iwu gọọmentị banyere ọnụ ahịa ọgwụ nwere ike ịkwado mmepụta ọgwụ na mpaghara a, nke ga-ebelata mbubata ma mee ka ego ọgwụ belata maka ndị ọrịa.

"Oke ọnụahịa ọgwụ Bekee na-ada na Naịjịrịa na-egbochi anyị ibi ogologo ndụ" - BBC News Ìgbò (3)

Ebe foto si, Getty Images

Kedụ ihe Gọọmentị na-eme?

Ọ malitere ịrụ ọrụ nke ọma afọ isii ka nke ahụ gasịrị mana kpuchiri naanị ntakịrị pasentị nke ndị bi na mba ahụ, ọkachasị ndị ọrụ gọọmentị.

Ọtụtụ ndị Naijiria, ọkachasị na mpaghara ime obodo, ka na akwụ ụgwọ site n'akpa ha.

N'afọ 2022, Naịjirịa weputara iwu ụlọọrụ ịnshọransị ahụike nke mba (NHIA), nke nyere iwu ka ụlọrụ nwere ndị ọrụ ise ma ọ bụ karịa inye ịnshọransị ahụike. Mana ndị ọkachamara na-ekwu na enweghị ike ma ọ bụ mmata zuru oke iji mejuputa atụmatụ a nke ọma.

Ozi nkowa mgbakwunye bụ Nkechi Ogbonna mere ya.

"Oke ọnụahịa ọgwụ Bekee na-ada na Naịjịrịa na-egbochi anyị ibi ogologo ndụ"  - BBC News Ìgbò (2024)
Top Articles
Latest Posts
Article information

Author: Zonia Mosciski DO

Last Updated:

Views: 6836

Rating: 4 / 5 (51 voted)

Reviews: 90% of readers found this page helpful

Author information

Name: Zonia Mosciski DO

Birthday: 1996-05-16

Address: Suite 228 919 Deana Ford, Lake Meridithberg, NE 60017-4257

Phone: +2613987384138

Job: Chief Retail Officer

Hobby: Tai chi, Dowsing, Poi, Letterboxing, Watching movies, Video gaming, Singing

Introduction: My name is Zonia Mosciski DO, I am a enchanting, joyous, lovely, successful, hilarious, tender, outstanding person who loves writing and wants to share my knowledge and understanding with you.